Asụsụ Nne Maka Ahụike na Ọdịmma: Ntụcha Ilu Igbo Ndị A Họọrọ
Keywords:
Language, mother-tongue, health, wellness, proverb, Asụsụ, asụsụ nne, ahụike, ọdịmma, iluAbstract
Igbo
Ọtụtụ ihe agbanweela n’ala Igbo tụmadị n’ihe gbasara ahụike na ọdịmma. Ka chi na-efo ka ụdị ọrịa dị iche iche na-abawanye n’ala Igbo; ọkachasị ọrịa ndị a na-asị na e nweghi ọgwụ e ji agwọ ha. A bagidere nchọcha n’isiokwu nchọcha a iji chọpụta njikọrọ dị n’etiti asụsụ na ahụike; ka ezipụta ụzọ dị iche iche asụsụ si emetụta ahụike na ọdịmma ndị na-asụ ya; ịchọpụta mkpatara ọrịa dị iche iche dị n’ala Igbo na ịtụpụta ụzọ a ga-esi belata mbawanye ha. A gbasoro usoro sọvee iji nwete ngwa nchọcha ma were atụtụ Echiche nsina tụchaa ilu Igbo ise metụtara ahụike na ọdịmma. A chọpụtara na asụsụ na-emetụta ahụike na ọdịmma ndị na-asụ ya; asụsụ nne ọ bụla nwere usoro ahụike dị n’ime ya maka ọdịmma ndị na-asụ ya; nhapụ ndị Igbo na-ahapụ asụsụ nne ha kpatara mmụba ọrịa dị iche iche n’ala Igbo. Nchọcha a na-ekwusi ike na asụsụ Igbo, nke bụ otu n’ime asụsụ nne e nwere n’ụwa abụghị naanị maka iji nwe mmekọrịta kama na e nwekwuru mmetụta asụsụ Igbo nwere n’ebe ahụike na ọdịmma ndị Igbo dị.
English
A lot has changed in Igbo land especially in connection with health and wellness. As days go by, different sicknesses are increasing in Igbo land particularly such sicknesses that are said to have no cure. This work aims to investigate the relationship between language and health; to show how language affects the health and wellness of the speakers; to find out the causes of some of the sicknesses in Igbo land and to suggest ways to reduce their spread. The connotation theory of Leech (1981) was used to analyse the five Igbo health and wellness proverbs used as data. The analysis reveals that language affects the health and wellness of the speakers; every indigenous language has health and wellness procedure embedded in it; as indigenous people abandon their mother-tongue in preference for foreign languages and life style, they are exposed to different sicknesses that come with foreign life styles; the study traced the increase in the spread of numerous sicknesses in Igbo land as the resultant effect of the Igbo people abandoning their mother-tongue in favour of foreign languages and life style. The study concludes that the Igbo language as one of the indigenous languages in the world is not just for communication but it also has effect on the health and wellness of the Igbo people.
Downloads
Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2025 C. N. Ugochukwu

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License.