Ịlụ Igwe Nwaanyị n’Okpuru Ọchịchị Ọnịcha Nọọtụ nke Steeti Anambara n’Oge Gboo na n’Oge Ugbu a

Authors

  • J. O. Onuegbu Nnamdi Azikiwe University, Awka
  • I. C. Isidienu Nnamdi Azikiwe University, Awka

Abstract

Nchọcha a lebara anya n'ịlụ igwe nwaanyị n'okpuru Ọchịchị Ọnịcha Nọọtụ nke Steeti Anambara n’oge gboo na n’oge ugbu a. Ịlụ igwe nwaanyị pụtara usoro alụmalụ ebe otu nwoke na-alụ karịa otu nwaanyị n'otu mgbe. Ọ bụ otu n’ime omenala pụtara ihe na ndụ ndị lgbo mana nsogbu dị na ya karịrị akarị. Nsogbu ndị ahụ bụ,  ka a ga-esi kee ekpe di nwe ụlọ ma ọ nwụọ, esemokwu, ọnwụike, ịgwọ ọgwụ, ọgbaaghara na tigbue zogbue nke na-esite n'aka ụmụaka maọbụ ndị nwunye apụta.Ọ bụ ọnọdụ ndị a kpalitere nchọcha a nke ebumnobi ya bụ ịchọpụta ihe ịlụ igwe nwaanyị pụtara n'okpuru Ọchịchị Ọnịcha Nọọtụ nke Steeti Anambara, ịchọpụta ihe kpatara nwoke ji alu igwe nwaanyị n'okpuru Ọchịchị Ọnịcha Nọọtụ n'oge gboo na  mgbanwe batara na ya n'oge ugbu a. Ọzọ bụ ịchọpụta ọghọm si n' ịlụ igwe nwaanyị aputa na ụzọ a ga-esi gbochie ọghọm  ndị ahụ. Iji mejupụta ebumnobi ndị a, a gara n'ọba akwụkwọ ma gụọ akwụkwọ dị iche iche ndị ọkamụta derela banyere isiokwu a. A gbara ndị mmadụ di iri atọ na isii sitere n'ogbe iteghete a kpọrọ Ebo itenaanị dị n'okpuru Ọchịchị Ọnịcha Nọọtụ ajụjụ ọnụ iji  nweta ihe e ji mee nchọcha a. A chọpụtara na nsogbu di n'ịlụ igwe nwaanyị dị ọtụtụ, dị ka ekworo, ịgba alụkwaghịm, ịkọ nsi, dgz. nke na-adapụtakịrị n'etiti ụmụaka na n’etiti ndị nwunye a na-alụ alụ. Nchọcha a ga-abara ndị ntorobịa, ọhaneeze, tụmadị ndị nne na nna uru nke ukwuu, n’ihi na ọ ga-eme ka ndị nne na nna na-akwanye ụmụ ha ndị nwaanyị ịlụ di n'ezinaụlọ a lụrụ igwe nwaanyị n'ihi ego maọbụ ihe nrite ga-apụta n’ime ya belata. Ọ ga-adị mma ma ọbụrụ na ndị gọọmenti wepụta usoro ọmụmụ ihe gbasara alụmdi na nwunye nye ndi mmadụ iji kọwaa ma mee ka a mata na nsogbu na ọghọm di n'ịlụ igwe nwaanyị karịrị uru dị na ya. Ọ bụ eziokwu na ịlụ igwe nwaanyị gbanyere mkpọrọgwụ na ndụ ndị Igbo, mana ugbu a, ọtụtụ ihe agbanweela. Ya bụ na ndị ntorobịa ga-agba mbọ hụ na ha gbasoro usoro ziri ezi n'alụmdi na nwunye iji gbanahụ ọnwụnwa na ihe ndị na-ebute nsogbu dị n’ịlụ igwe nwaanyị.

Downloads

Download data is not yet available.

Downloads

Published

2024-11-12

How to Cite

Onuegbu, J. O., & Isidienu, I. C. (2024). Ịlụ Igwe Nwaanyị n’Okpuru Ọchịchị Ọnịcha Nọọtụ nke Steeti Anambara n’Oge Gboo na n’Oge Ugbu a. Ijele International Journal of the Society for Igbo Studies, 1(1), 68–80. Retrieved from https://ijele.org.ng/index.php/ijele/article/view/10

Issue

Section

Articles