Egwu Ọdịnala Ọ̀gwụ̀ Igbo: Ngwaọrụ Ịkwalite Asụsụ Igbo n’Oge Ugbu a
Keywords:
Egwu, Ọdịnala, Ọgwụ Igbo, Omenaala, Asụsụ, Music, Tradition, Awgu, Culture, LanguageAbstract
Igbo
Egwu ọdịnala bụ egwu ndị ahụ e ji mara obodo ọbụla n’ala Igbo. Nke a mere na mgbe ọbụla ha gụrụ egwu ndị a, onye ọbụla nụrụ ya bụ egwu ga-amata obodo nwe ya. Ọ bụghị ihe ịtụnanya ma anyị sị na ọtụtụ ndị ntoroọbịa n’oge ugbu a amaghị egwu ọdịnala ndị obodo ha ma ya fọdụzịa ịgụ ya n’ihi na ha amaghị asụ asụsụ Igbo. Nke a wee bụrụ nnukwu ihe ịma aka n’ihu nye ọnọdụ asụsụ Igbo n’oge ugbu a nakwa n’ọdịniihu n’ihi na ọ bụ asụsụ ka e ji agụ egwu. Ebumnobi Nchọcha a bụ ka e si n’egwu ọdịnala Ọ̀gwụ̀ na-akwalite asụsụ Igbo. E mere nchọcha i ji gosi etu egwu ọdịnala obodo Ọ̀gwụ̀ ga-esi kwalite asụsụ Igbo. Ọbụ n’obodo Ọ̀gwụ̀ nke dị na Steeti Enugwu ka a nọ wee mee nchọcha a site n’ịgba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ. E ji usoro nsere wee họrọ ndị a gbara ajụjụ ọnụ ma tulekwa ọtụtụ ihe ndị ọkammụta derela n’akwụkwọ gbasara isiokwu a. E jikwa atụtụ asụsụ inweghachi ike nke a kpọrọ “Language Revitalization Theory” n’asụsụ bekee wee tulee ederede a wee chọpụta na asụsụ e ji agụ egwu ọdịnaala Ọ̀gwụ̀, ga-enye aka kwalite asụsụ Igbo ma ọ bụrụ na ndị nabata asụsụ miri emi ndị Ọ̀gwụ̀ ji agụ egwu ha. Ọ dịkwa mkpa na ndị Igbo gụrụ akwụkwọ na-eche na ụmụ ha ịsụ Igbo ga-ebutere ha ileda anya n’ezi nwee nchegharị obi maka ya. Aro onye nchọcha bụ ebe ụmụaka bụ ndị na-amụtakarị ihe site n’ọnụ ndị mụrụ ha, ndị nne na nna ga-agba mbọ na-asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo site na ịgụrụ ha egwu ọdịnala obodo ha ọkachasị oge ha dị na nwata, nakwa iji atụmatụ okwu dị ka ilu, akpalaokwu, agwụgwa, okwu ntụhị nakwa oyiri ha wee na-agwa ụmụ ha okwu. A na-atụkwa anya na ndị niile ala Igbo ji okwu ha agba izu n’imepụta ejije nakwa ịkụ egwu ga -eji asụsụ Igbo na-eme ihe ndị a, nke a ga-enye aka ịkwalite asụsụ Igbo ma mee ka ọ kwụrụ chim n’etiti asụsụ ndị obodo ọzọ .
English
Igbo traditional music is the type of music that is perculiar to a particular culture area. It is not an overstatement when we aver that youths of this generation do not even know the wordings of the traditional music of their various places of birth not to think of dancing to it. This, is a very big obstacle to the development of Igbo language in this age and in future as core language terms are woven in music. Objective of this work is to showcase how Awgu traditional music can be use to promote Igbo language. This work, a qualitative research design, was carried out in Awgu. Simple random sampling was used in selecting the people that were interviewed. Using Language Revitalization Theory, this work found out that the language used in music of Awgu people helps in promoting their language. The work suggests that as children always learns from their parents, it is pertinent that parents sing their traditions songs and display their traditional music for their children, this will make their children to understands Igbo language and make it to stand the test of time among the comity of other languages.
Downloads
Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2024 A.C. Ephraim-Chukwu

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License.