OLILO NA NDAPỤ MKPỤRỤ ỤDA N’IGBO OWERRI
Keywords:
Asụsụ, Olundị, Fọnọlọji, Olilo, Ndapụ, Language, dialect, phonology, assimilation, elisionAbstract
Igbo
Asụsụ Igbo nwere ọtụtụ olundị. Nke a mere e ji nwee Igbo izugbe, nke bụ ụdị asụsụ Igbo onye ọ bụla na-amụ ma na-asụkwa Igbo ga-enwe ike ịghọta nke ọma. Ụfọdụ mgbe, ụsoro ụdaasụsụ Igbo izugbe na olundị ndi mejupụtara ya anaghị abụcha otu ihe. Olundị dị iche iche n’ala Igbo nwere fọnịm nke aka ha, nke na-emetụta fọnịm Igbo izugbe, ndapụ na olilo dị n’olundị Owerri na-emetụta ọmụmụ asụsụ Igbo izugbe n’ihi na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ bụ ndị Owerri na-eji olundị ha asụ ma na-ede Igbo oge a chọrọ ka ha jiri Igbo izugbe rụọ ọrụ n’ihi amaghị ihe dị iche n’etiti fọnịm ndị kwesịịrị Igbo izugbe na nke kwesịrị olundị Owerri. Nchọcha a lebara anya n’olilo na ndapụ mkpụrụ ụda n’olundị Owerri. O jiri atụtụ adịmiche lenye anya n’ụdị olilo na ndapụ mkpụrụ ụda pụtara ihe n’olundị Owerri ma lenyekwa anya n’ihe kpatara e ji nwee olilo na ndapụ n’olundi Owerri. E ji ndị na-asụ olundị Owere dị ka epum ha, ihe ndị e nwetere site na mkparịtaụka ndị nchọcha na ndị Owerri mere na ihe ndị a gụtara n’akwụkwọ gbasara ụdaasụsụ, olilo na ndapụ wee rụọ ọrụ a. A chọpụtara ụdị olilo atọ: olilo nlocha, olilo mmakọ na olilo nlofọ na ụdị ndapụ mkpụrụ ụda abụọ n’olundị Owerri. Ha bụ ndapụ ụdaume na ndapụ mgbochiume. Olundị Owerri na-enwe ndapụ mkpụrụ asọsọ ‘-ghị/-ghi’ mgbe a na-emepụta njụ. A hụkwara na olilo na ndapụ na-emekọ ọnụ n’akparamagwa. Ihe dị iche bụ na olilo n’olu Owerri bụ sọọsọ ụdaume ka ọ na-emetụta, ebe ndapụ na-emetụta ụdaume na mgbochiume.
English
Igbo language has many dialects. This is why there is standard Igbo, the Igbo anyone studying or speaking Igbo will be able to understand very well. Sometimes, the sound structures of the standard Igbo and that of its dialects are not the same. Igbo dialects have their phonemes which interact with the standard Igbo phonemes. Elision and assimilation in Owerri Igbo affect the learning of Igbo Language because some Owerri students use their dialect when speaking and writing Igbo when they are expected to use the standard Igbo. The research adopted the theory of contrastive analysis to analyse why there is elision and assimilation in Owerri Igbo. Data were collected from Owerri indigenes that speak the dialect fluently through interactions and from books. Three types of assimilation were discovered: complete assimilation, fusion and partial assimilation. Two types of elision were equally discovered which are vowel and consonant elision. In Owerri Igbo, there is elision of the negative morpheme ‘ghị/-ghi’ during the production of negation. Both elision and assimilation interact in Owerri Igbo. The difference is that assimilation only occurs in vowels while elision occurs in both vowels and consonants.
Downloads
Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2025 G. C. Ekwugha, G. N. Egwuonwu-Chimezie

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License.