ỊGBA ALỤKWAGHỊM N’ALA IGBO: MKPATARA NA MGBANWE N’OGE UGBU A

Authors

  • I. C. Isidienu Nnamdi Azikiwe University, Awka
  • A. C. Ephraim-Chukwu Nnamdi Azikiwe University, Awka
  • A. C. Onyekelu Nnamdi Azikiwe University, Awka

Keywords:

Ịgba Alụkwaghịm, Ala Igbo, Mkpatara, Mgbanwe, Oge Ugbu a, Divorce, Igbo land, Causes, Changes, Contemporary Society

Abstract

Igbo

Ịgba alụkwaghịm bụ ịgbasa alụmdi na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Ọ bụ ịkwụsị mmekọrịta na ọrụ dị n’etiti di na nwunye. Ịgba alụkwaghịm na-abụ ihe na-agbakwoju anya ma bụrụkwa ọnọdụ ọjọọ na-emetụta n’obi na n’ime mmụọ. N’ihi ajọ ọnọdụ ịgba alụkwaghịm na-eweta ka nchọcha a ji leba anya n’ihe na-ebute oke ịgba alụkwaghịm na nsogbu o na-eweta n’oge ugbu a; tinyere ihe a ga-eme ka ọnọdụ ọjọọ a wee belata.  A gụrụ akwụkwọ dị iche iche ndị ode derela gbasara isiokwu nchọcha a. E sitere n’ịgba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ were chịkọta ihe e ji mee nchọcha a. E sitekwara n’ihe ndị a hụrụ anya na nleru anya were chịkọta ihe e ji mee nchọcha a. A chọpụtara n’ihe kacha ebute ịgba alụkwaghịm n’oge ugbu a bụ enweghị nghọta na ntukwasịobi n’etiti di maọbụ nwunye nke na-ebute okwu na ụka n’etiti ha nakwa ndị ntorobọbịa e nweghị ezi ọzụzụ gbasara alụmdi na nwunye tupu ha a banye n’ime ya. O kwesiri ka ndị banyere n’alụmdi na nwunye mụọọ onwe ha nke ọma, nwee nghọta na ezi ntụkwasị obi n’etiti onwe ha. Ọ bụrụ na di na nwunye hazie onwe ha nke ọma, were udo na ịhụnanya na-ebi ndụ ha, ọ ga-eme ka ịgba alụkwaghịm bụrụ akụkọ mgbe gboo.

 

 English

Divorce is the lawful termination of a marriage. It is the dissolution of marital bond and responsibility between husband and wife. Divorce is complex issue, and it’s often emotionally challenging. It is based on the problems associated with divorce that this research work is set to embark on investigating the causes and problems of divorce in the contemporary society and to proffer solutions to reduce it. A review of related literature was done. Data for the study was collected through oral interview. Also watching and observation of events are part the instruments for data collection. At the end of the research, this work found out that, the major causes of divorce in the contemporary society are lack of understanding and trust which breeds catastrophe among couples. It is suggested that couples should study themselves very well, should have good understanding and trust before embarking on marriage. If couples will be able to put themselves together, live in peace and love, divorce will be a thing of the past.

Downloads

Download data is not yet available.

Downloads

Published

2025-04-01

How to Cite

Isidienu, I. C., Ephraim-Chukwu, A. C., & Onyekelu, A. C. (2025). ỊGBA ALỤKWAGHỊM N’ALA IGBO: MKPATARA NA MGBANWE N’OGE UGBU A. Ijele International Journal of the Society for Igbo Studies, 2(1), 26–36. Retrieved from https://ijele.org.ng/index.php/ijele/article/view/18

Issue

Section

Articles