AGỤMAGỤ DỊ KA ENYO E JI AHỤTA EBIMNDỤ NDỊ IGBO: ILEBA ANYA N’IDUUAZỊ IGBO ỤFỌDỤ
Abstract
Igbo
N’ihi mmepe batara n’ala Igbo n’oge ugbu a, ọtụtụ ụmụ Igbo amaghị nsihụtụụwa ndị Igbo. Nke a mere ndị odee ji bagide ime nchọcha n’isi okwu edemede a nke hiwere isi n’iji iduuazị ezipụta ebimndụ ndị Igbo site n’ịgba n’anwụ ka ndị odee a họọrọ iduuazị ha si jiri ha zipụta ebimndụ ndị Igbo. A na-atụ anya na nke a ga-enye aka mee ka ihe gbasara iduuazị pụtawaga ihe. Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu ndị Igbo si ebi ndụ ha na ka ndị odee ndị a si zipụta ha n’edereede ha. A gbasoro Atụtụ Amụmamụ Omenala were mee nchọcha a. Atụtụ a na-elekwasị anya n’etu ihe si metụta ihe gbasara echiche, mba na agbụrụ ha. Ụdịdị nchọcha e mere bụ nke nkọwa n’ihi na ọ bụ usoro a ga-enye aka ka a ghọta nke ọma etu ihe si kwụrụ. Nchọpụta na-egosi na iduuazị ndị a bụ enyo e ji ahụta ebimndụ ndị Igbo n’ihi na ha zipụtara ọtụtụ ihe e ji mara ndị Igbo nke gụnyere ọrụ ugbo, ịgba mbọ, ịhụnanya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. A chọpụtakwara na iduuazị so n’otu ụzọ e si agbazi akparamaagwa ndị mmadụ n’ihi na onye gụrụ iduuazị ndị a ga-amụta ọtụtụ ihe n’ime ha. N’ikpeazụ, a chịkọtara nchọcha ma tụnyekwa alo ka onye ọ bụla bụ nwaamaala Igbo malite inwe mmasị n’ịgụ agụmagụ iduuazị n’ihi na ọtụtụ ihe mmụta jupụtara n’ime ya.
English
There is a decline in the knowledge of Igbo culture among the Igbo people as a result of civilization and global interactions. This concern prompted the researchers to embark on this study which aims to x-ray how the Igbo novelists were able to creatively use their works to showcase how the Igbo people live. This will enable the public to be aware of “the past and the present state of affairs” as regards the Igbo people's philosophy about life. This study embraces the Cultural Studies theory for analysis. It discusses the cultural life of the race. It is also expected that this will help to promote the Igbo creative works. This research is descriptive as it will help showcase the state of things. Findings show that these creative works serve as mirrors to see the lifestyle of the Igbo people because they show-case a lot of things by which the Igbo people are known, which include farming, hardwork, love etc. It was also found out that prose is one of the ways to correct people’s character because any body that reads these works will learn a lot of things from them. The study was concluded and the researchers recommended that every Igbo person should develop interest in reading creative works written in Igbo because there are a lot of lessons in them.
Downloads
Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2025 O. R. Ifeka, A. P. Ego

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License.