Asụsụ Igbo: Ngwa Nchekwaba Omenala, Akụnaụba, Nzikọrịtaozi, Agụmakwụkwọ, Ndọrọndọrọ Ọchịchị Na Alụmalụ na Ndụ Ndị Ntoroọbịa Igbo
Keywords:
Asụsụ Igbo, omenala, akụnaụba, agụmakwụkwọ, nzikọrịtaozi na alụmalụ, Igbo language, culture, economy, education, communication and marriageAbstract
Igbo
Nchọcha a lebara anya n’ịhụta asụsụ Igbo dịka ngwa nchekwaba omenala, akụnaụba, nzikọrịtaozi, agụmakwụkwọ, ndọrọndọrọ ọchịchị na alụmalụ na ndụ ndị ntoroọbịa Igbo. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ka asụsụ Igbo si bụrụ ngwa e ji echekwaba omenala, akụnaụba, nzikọrịtaozi na ihe ndị ọzọ banyere obibi ndụ ndị ntorobịa Igbo. Fishman (1991) mọdelụ nke hiwereisi n’asụsụ isi n’ọgbọ gafere n’ọgbọ bụ atụtụ ji mee nchọcha a. Nchọcha a chọpụtara na ndị ntorobịa bụ ndị nnọchite anya obodo ọbụla nwere maka nchekwaba omenala, akụnaụba, alụmalụ na usoro obibi ndụ ndị ọzọ. Ọ dị mkpa na aga-ahụ na ndị ntoroọbịa ma ndị bi n’ala Igbo, ma ndị bi na mba ofesi mụtara ihe ndị a n’aka ndi okenye. Ọnọdụ nchekwaba asụsụ na omenala Igbo bụ ihe a na-aghaghị iji kpọrọ ihe maka na agbụrụ ọbụla tufuru asụsụ na omenala ha, bụ njirimara ha etufuọla ihe niile banyere ha. Na mmechi, nchọcha a na-akwadosi ike na ihe banyere asụsụ na omenala Igbo bụ ọkụ nke ndị nna nna anyị ha gụnyere anyị n’aka agaghị anyụnahụ anyị. Nchọcha a na atụnye aro ka ndị nne na nna, ndi nkuzi, otu ebiri, ọhanaeze na ndị gọọmenti ala Igbo niile ga-etinye anya ma tinyekwa aka iji hụ na ọnọdụ asụsụ Igbo gbagotere n’ụzọ niile dị ka a tụrụ anya ya.
English
This paper examined the use of the Igbo language as tool for the preservation of Igbo culture, economy, communication, education, politics and marriage in the life of the youths. The objective of this study is to find out how Igbo language is a vital tool in the preservation of Igbo culture, economy, communication, education and marriage in the life of the Igbo youths. The study adopted the Fishman (1991) model of intergenerational transmission. The study discovered that the youths are the future propagators of the culture, economy, communication, education, politics, marriage and other societal ideologies of a people. Therefore, it is very necessary that the youths whether living in their different Igbo communities or in diaspora should be well positioned to learn these ideologies from the elders. The preservation nature of the language and culture of the Igbo people must be viewed with all seriousness because the loss of the language and culture of any ethnic group amounts to a complete loss of their mark of identity. In conclusion, this study is significant in the sense that it is highly supportive of the Igbo people taking cognicance of the point that we, the Igbo people should guide against losing our God given cultural identities and heritage handed over to us by our forefathers and ancestors from going into extinction due to our own negligence. The study recommends that parents, teachers, age grades, entire Igbo populace and government in Igbo land and diaspora should put all hands on deck to ensure the continuous existence of Igbo language and culture to an enviable position as expected.
Downloads
Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2024 E. N. Onukawa

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License.