AMAMAKA NA AGBAMBỌ GBASARA AGỤMAKWỤKWỌ NA NDỤ ỤMỤAKA: NNYOCHA AGỤMAGỤ IGBO ỤFỌDỤ

Authors

  • O. R. Ifeka Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, University, Igbariam Campus
  • C. C. Anachunam Nnamdi Azikiwe University, Awka

Keywords:

Amamaka, Agbammbọ, Agụmakwụkwọ, Ụmụaka, Agụmagụ, challenges, hardwork, education, children, literature

Abstract

Igbo

Nchọcha a nyochara ebumnobi ndị odee agụmagụ ụfọdụ dị ka ndị na-akwado agbambọ nke dabeere na nkwenye ndị Igbo banyere ịrụsi ọrụ ike. Ebumnobi nchọcha a bụ inyocha agụmagụ Igbo ụfọdụ iji gosi n’ezie na ndị odee sitere n’agụmagụ ha na-akụzi na ịgba mbọ na-amịta ezi mkpụrụ na ndụ mmadụ. Akwụkwọ agụmagụ ndị e ji mee nchọcha bụ Ụkpaka Mịịrị Onye Ụbịam nke Ubesie (1975), Ugonna nke Ofomata (2001) na Chukwu Nọ Nso nke Okechukwu (n.d.). Atụtụ Rịalizim ka e ji tụchaa akwụkwọ agụmagụ ndị a họọrọ ma gbaso nchọcha nkọwa. Nchọpụta gosiri na ndị odee agụmagụ Igbo na-ezipụta ihe ịma aka ụmụaka na-agabiga na etu ha si agba mbọ n’agụmagụ ha. A chọpụtara na ụmụaka ndị hụtara onwe ha na nsogbu ezinụlọ dị iche iche na-agbasị mbọ ike ka ọnọdụ ha ghara igbochi ha inweta ezi mmụta. A chọpụtakwara na ụfọdụ ụmụaka nọ n’ụbịam na-arụ ọrụ dị iche iche iji nweta ego ha ga-eji kwụọ ụgwọ akwụkwọ ma gaa n’ihu n’agụmaakwụkwọ ha. Site na nchọpụtara ndị a, nwanchọcha na-atụ aro ka ndị mmadụ na-agba mbọ ịhụ na ha nyere ụmụ ha ma ọ bụ nwata ọ bụla ha na ha bi ezigbo ọzụzụ n’agụmakwụkwọ, ka e wee belata ahụhụ ụmụaka na-ata n’agụmakwụkwọ ha.

 

English

This research examines the intentions of the authors of the selected texts, presenting them as promoters of perseverance which is dependent on the Igbo belief in diligence. The major focus of the study is to demonstrate, through these texts, how the authors portray the struggles children encounter in their educational journey and emphasize that such challenges should not discourage them from working hard to improve their situations. The Igbo literary works analyzed in this study are Ụkpaka Mịịrị Onye Ụbịam by Ubesie (1975), Ugonna by Ofomata (2001) na Chukwu Nọ Nso by Okechukwu (n.d.). The study adopts the theory of Realism for analysis and applies a descriptive analytical method. Findings reveal that some children in difficult circumstances engage in various forms of labour to earn money for school fees in order to continue their studies. The research concludes that regardless of a child’s background, hard work, perseverance, and good character can help them achieve their educational goals. Consequently, the study recommends that parents, guardians, teachers, and the government collaborate to provide adequate support and accessible quality education for children.

Downloads

Download data is not yet available.

Downloads

Published

2025-04-01

How to Cite

Ifeka, O. R., & Anachunam, C. C. (2025). AMAMAKA NA AGBAMBỌ GBASARA AGỤMAKWỤKWỌ NA NDỤ ỤMỤAKA: NNYOCHA AGỤMAGỤ IGBO ỤFỌDỤ. Ijele International Journal of the Society for Igbo Studies, 2(1), 62–73. Retrieved from https://ijele.org.ng/index.php/ijele/article/view/21

Issue

Section

Articles