ADỊMIIRE IJI USORO NKỤZI EGWUREGWU AKỤZI ỤTỌASỤSỤ IGBO NA MMETADEBE ỤMỤAKWỤKWỌ SEKỌNDIRI NTA

Authors

  • N. J. Eze National Open University of Nigeria, Abuja

Keywords:

Adịmire, Nkụzi egwuregwu, Usoro, Ụtọasụsụ

Abstract

Igbo

Nchọcha a lebara anya n’adịmiire iji egwuregwu akụzi ụtọ asụsụ na mmetadebe ụmụakwụkwọ sekondịrị nke nta. Nka nchọcha e ji rụ ọrụ ebe a bụ nchọpụta ndịnakụkụ. Ọnụọgụ ndị e jiri mee nchọcha a di otu narị (100) ụmụakwụkwọ ndị nọ n’ ogo agụmakwụkwọ sekọndịrị nta nke abụọ e ji usoro nsere wee họpụta ụlọ akwụkwọ abụọ. Ajụjụ nchọcha atọ ka eji hazie nchọcha a. Ụlọakwụkwọ abụọ ahụ ka e tinyere n’ otu abụọ ndị a: otu “A” otu arụmarụ (experimental group), ebe otu “B” bu otu mgbazị (control group), Otu abụọ
ndị a nwere ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha dị iri ise (50) n’ ụlọakwụkwọ nke ọ bụla. Ngwa nchọcha, bu ule mmakọ, eziokwu/asị na mmebe ahịrịokwu. Maka ịnyọcha nzumoke ngwa nchọcha. Aha ngwa nchọcha ahụ bu “nnwàle ụtoasụsụ Igbo (NUI) n’ aha ịchafụ. E jiri ntụcha mịịn (mean) na ndipu n’izugbe (standard deviation) wee nweta osịsa ajụjụ nchọcha a. Nchọcha e mere gosịrị na ndị otu arụmarụ (experimental group) mere nke ọma karịa ndị otu mgbazị (control group) bụ nke sitere n’usoro nkụzi egwuregwu e jiri kụziere ha ụtoasụsụ Igbo. Site n’ihe a chọpụtara, ọchọcha tụtara ero ndị a: ka atụlegharịa kụrikụlụm Igbo, webatara ụmụaka usoro iji egwuregwu akụzị ụtọ asụsụ. Nke a ga-eme ka nghọta ụto asụsụ Igbo kara mfe. O kwesiri ka a na-ehiwere ndị nkụzi asụsụ Igbo wọkshọpụ, semina na kọnfrens, ka e wee kụziere ha etu e si eji egwuregwu akụzi ụtoasụsụ Igbo ya na na ngalaba ihe ọmụmụ ndị ọzọ dị iche iche dị ka omenala Igbo, ọmụmụ mgbakọ na mwepụ, dgz.

English

This study meticulously examined the effectiveness of using game-based learning to enhance the Igbo language proficiency of junior secondary school students. The research design employed for this study is quasi-experimental. The sample size for the research consisted of one hundred (100) junior secondary school (JSS 2) students selected through a random sampling method from two schools. Three research questions guided the study. The two selected schools were divided into two groups: Group “A” as the Experimental Group and Group “B” as the Control Group. Each group comprised fifty (50) students. The research instrument used included tests in comprehension, true/false, and sentence construction to measure Igbo language proficiency. The instrument was titled “Igbo Language Achievement Test (ILAT)”. Data were analyzed using mean and standard deviation to interpret the results. Findings from the study indicated that the Experimental Group performed significantly better than the Control Group, attributing
their success to the game-based learning method employed in teaching Igbo language proficiency. Based on these findings, the study made the following recommendations: The Igbo language curriculum should be reviewed to incorporate game-based teaching methods that make learning the Igbo language grammar easier and more engaging. Secondly, regular workshops, seminars, and conferences should be organized for Igbo language teachers to train them on how to effectively use game-based methods to teach Igbo language, as well as other related subjects like Igbo culture, mathematics, and more.

 

Downloads

Download data is not yet available.

Downloads

Published

2025-06-24

How to Cite

Eze, N. J. (2025). ADỊMIIRE IJI USORO NKỤZI EGWUREGWU AKỤZI ỤTỌASỤSỤ IGBO NA MMETADEBE ỤMỤAKWỤKWỌ SEKỌNDIRI NTA. Ijele International Journal of the Society for Igbo Studies, 1(1), 22–33. Retrieved from https://ijele.org.ng/index.php/ijele/article/view/3

Issue

Section

Articles