Ntụcha Aha Nsina ‘Nwa’ Mebe n’ Usoro Sayensị Asụsụ

Authors

  • F. U. Ibeh Nnamdi Azikiwe University, Awka
  • O. F. Okere Alvan Ikoku Federal university of Education, Owerri

Keywords:

Aha, Sayensị Asụsụ, asụsụ, Omenala

Abstract

Igbo

Ederede a bụ ntụcha aha e si na nwa mebe n’usoro sayensị asụsụ. Aha bụ okwu e ji ama mmadụ maọbụ ihe ọbụla na-aza. Aha a bara nwa (mmadụ) na-enwe ihe ọ na-ezipụta ndị nwere ike ịbụ ngosipụta ebe a chọrọ nwa achọ, ebe a mụrụ naanị nwa nwoke maọbụ nwaanyị na ihe ndị ọzọ. Odee chọrọ isi n’ụzọ a mụbaa ihe e dere n’asụsụ Igbo maka ịkwalite ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. Ebumnobi ederede a bụ idepụta ụfọdụ aha dị iche iche e si na nwa mebe iji tụchaa ndịnime aha ndị ahụ n’asụsụ Igbo. Ọzọ bụ ịtụcha ndịnime aha ndị ahụ n’omenala Igbo na ịchọpụta ka asụsụ, omenala na aha si metụta. Usoro nchọcha bụ nke sọvee nkọwasị. Atụtụ nchọcha bụ nke a kpọrọ atụtụ nrụgara aka nke Ogden na Richards (1923) na njirimee nke Wittgestein (1953). Ngwaọrụ nchọcha bụ nke odee wetara n'akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche na ajụjụ ọnụ ọ gbara ụfọdụ nne na nna iji nweta ụsa ụfọdụ ebumnobi ederede a. Ụfọdụ nchọpụta e nwetagasịrị na-egosi n’ezie n’aha ndị a e si na nwa mebe nwere mpụtara dị iche iche metụtara ihe megara n’ezinaụlọ tupu a mụọ nwa ahụ. Ụfọdụ aha bụ aha na aha, ụfọdụ bụ aha na ngwaa ebe ụfọdụ bụ aha na nkọwa ebe ụfọdụ bụ njụajụjụ na ihe ndị ọzọ. Ederede a ga-abara ụmụ akwụkwọ, ndị nkụzi na ndị nwere mmasị n'ụdị nchọcha a uru ma nyekwa aka n’izipụta ụzọ nkuzi ihe ndị ọzọ n’asụsụ na omenala Igbo. Nchọcha a na-atụ aro ka e mere nchọcha n'ụdị isiokwu a gaa n'ihu maka inwe ọtụtụ ihe ederede n’asụsụ Igbo.

English

The study is a linguistic analysis of Igbo names derived from ‘child’ (person). A name is a term used in identifying a person, place or thing. The name given to any person has somthiing it signifies which could be that it has been difficult to have a child in a particular family or that a family lackes mal or female child and so on. The writer intends tue the study to add to the existing knowledge of things written in Igbo language for the promotion of Igbo language and culture. Some of the objectives of the study are to select some names derived from ‘child’ so as to deduce the inherent meaning of the names in Igbo language and culture. Another objective is to highlight the relationship between language, culture and names. The study adopts descriptive survey method. The work is guided by Referential theory of meaning by Ogden and Richards (1923) and Use theory of meaning by Ludwig Wittgenstein (1953). The secondary data for the work are soursed from relevant literature while the primary source of data collection is oral interview of some parents. Some of the findings reveal that these names generated from ‘child’actually have different meanings relating to the perculiar circumstances of the parents. Other findings show that some names are formed with two nouns, some with a noun and a verb, some with a noun and an adjective, some interogatives and so on. The study will be beneficial to scholars, teachersand interested researchers in the field of Igbo language. The suggests that further study should be encouraged so as to have moreworks written in Igbo language.

Downloads

Download data is not yet available.

Downloads

Published

2025-06-24

How to Cite

Ibeh, F. U., & Okere, O. F. (2025). Ntụcha Aha Nsina ‘Nwa’ Mebe n’ Usoro Sayensị Asụsụ. Ijele International Journal of the Society for Igbo Studies, 1(1), 45–53. Retrieved from https://ijele.org.ng/index.php/ijele/article/view/5

Issue

Section

Articles