Ọnọdụ Ọmụmụ Asụsụ Igbo Taa n’Ụlọ Akwụkwọ Dị n’Ala Igbo

Authors

  • C. E. C. Ogwudile Nnamdi Azikiwe University, Awka

Keywords:

Asụsụ Igbo, Ụlọ Akwụkwọ, Nne na Nna, Ọdachi, Igbo Language, Schools, Parents, Problems

Abstract

Igbo

Isiokwu nchọcha a gbadoro  ụkwụ n’ọnọdụ ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ dị n’ala Igbo.  Ọmụmụ asụsụ Igbo n’ala Igbo abụghị ihe e ji eme  ọnụ.  Ọ bụ nke a so n’ihe kpalitere mmụọ Ọchọcha ime nchọcha n’isi okwu a. Mbunobi  ọchọcha bụ ileba anya n’ihe a ga-eme ka ọnọdụ  ọmụmụ asụsụ Igbo gbanwee dịkarịa mma n’ụlọ akwụkwọ dị n’ala Igbo dị ka ogbo ya ndị  ọzọ, Yoruba na Awụsa.  Ọzọ, bụ  ịmata ihe bụ  ọdachi dịịrị  ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ dị n’ala Igbo.  Ọchọcha ji atụtụ njirime wee mee nchọcha a.  Ọ chọpụtara na nnukwu  ọdachi dịịrị  ọmụmụ asụsụ Igbo bụ ndị nne na nna. Ọtụtụ ndị nne na nna anaghị eji asụsụ Igbo azụlite  ụmụ ha n’ezinaụlọ ha. N’aka nke  ọzọ, ụfọdụ  ụlọ akwụkwọ n’ala Igbo anaghị amụ asụsụ Igbo,  ọ kachasị nke ndị nkịtị nwe. Ha anaghịkwa ekwe ka  ụmụ akwụkwọ sụọ asụsụ Igbo na klas. N’uche ha,  ọ bụ asụsụ ndị iti. N’ụlọ akwụkwọ  ụfọdụ ndị na-amụ asụsụ Igbo, ndị nkụzi na  ụmụ akwụkwọ ejighị ya kpọrọ ihe.  Ndị gọọmentị n’onwe ha ahụghị asụsụ Igbo n’anya dị ka ha hụrụ asụsụ ndị  ọzọ dị ka Bekee, Frenchị dgz. Ọ bụ usoro sovee ka  Ọchọcha gbasoro jiri mee nchọcha a. Aro Ọchọcha bụ ka: ezinaụlọ niile n’ala Igbo jisi ike were asụsụ Igbo na-azụlite  ụmụ ha; gọọmenti etiti ga-eme ya ka ọ bụrụ iwu na  ụlọ akwụkwọ niile dị n’ala Igbo ga na-amụ asụsụ Igbo bido n’ọta akara ruo na sekọndịrị. 

 

English

The research focuses primarily on the state of learning the Igbo language in schools in Igbo land. The  learning of Igbo language faces a lot of challenge. This is the motivation of the resarcher to carry out this work. The objectives of the study is to find out what should be done to better the condition of Igbo language learning in schools in Igbo land to be in tandem with other Nigerian languages, like Housa and Yoruba. Another, is to discover the problems bedevvilling the learning of Igbo language in schools in Igbo land. Use theory was used for this research. It was observred that the major causes of impediment in learning Igbo language are the parents. Many parents don’t use Igbo language to bring up their children at home. Moreso, some schools in Igbo land don’t learn Igbo language, more especially the private ones. They do not even allow the speaking of Igbo language in the class. They regard it as language of the illiterates. In some schools that teach the language, teachers and students do not regard it as something. Government, themselves, do not like Igbo language like they do to other languages like English, French etc. Survey method was adopted in this study. The work recommends: that every family in Igbo land should try to use Igbo language in bringing up their children. Government should make it as a law that all the schools in Igbo land should learn Igbo language, starting from nursery to secondary school. 

Downloads

Download data is not yet available.

Downloads

Published

2024-11-12

How to Cite

Ogwudile , C. E. C. (2024). Ọnọdụ Ọmụmụ Asụsụ Igbo Taa n’Ụlọ Akwụkwọ Dị n’Ala Igbo. Ijele International Journal of the Society for Igbo Studies, 1(1), 81–89. Retrieved from https://ijele.org.ng/index.php/ijele/article/view/6

Issue

Section

Articles